23
Onyenwe anyị Ezi omume Anyị
“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,
Izrel ga-ebikwa nʼudo.
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.*
 
“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
Ndị amụma ụgha.
Ma banyere ndị amụma,
obi m na-agbawa nʼime m,
ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.
Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,
dịka onye ṅụbigara mmanya oke,
nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,
na site nʼokwu nsọ ya.
10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.
Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,
ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.
Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.
Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.
 
11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.
Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
 
13 “Ahụrụ m ihe arụ
nʼetiti ndị amụma Sameria:
Ha buru amụma site nʼike chi Baal,
si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya
nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.
Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.
Ha na-agba ndị ajọ omume ume,
si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.
Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;
ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”
15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”
16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,
nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.
Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,
o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,
Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’
Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,
ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’
18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,
hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?
Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,
ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,
nke ga-abịa
bufuo ndị ajọ omume a.
20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya
tutu ruo mgbe o mezuru
ihe niile dị ya nʼobi.
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,
unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.
21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,
ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.
O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,
ma ha nọkwa na-ebu amụma.
22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,
ha gaara ekwusara ndị m okwu m,
nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa,
sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
 
23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,
ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo
nke m na-enweghị ike ịhụ anya?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi? 27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal. 28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya. 31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’ 32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ndị amụma ụgha na ịjụ ase ụgha.
33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole?§ Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’ 34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi* si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ. 35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ 36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị. 37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’ 38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’ 39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha. 40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”
* 23:6 Onyenwe anyị, bụ ezi omume anyị. 23:29 Maọbụ, na-ajụ ajụjụ sị 23:29 Lit. Hama § 23:33 Akwụkwọ ụfọdụ na-asị, unu onwe unu bụ isi okwu ya * 23:34 Maọbụ, okwu