5
Kwụghachi nkwa ị kwere Chineke 
  1 Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.   
 2 Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu  
maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,  
maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.*Ilu 20:25  
Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe  
ma naanị nʼụwa ka ị nọ,  
nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.   
 3 Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,  
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.   
 4 Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.   5 Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.   6 Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?   7 Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.   
Akụnụba enweghị isi 
  8 Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha.   9 Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.   
 10 Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.  
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.  
Nke a bụkwa ihe efu.   
 11 Akụ na-abawanye,  
ndị na-eri ya na-abawanyekwa.  
Olee uru ha bara nye onyenwe ha  
karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?   
 12 Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,  
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,  
ma oke iriju afọ onye ọgaranya  
anaghị ekwe ya rahụ ụra.   
 13 Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,  
mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,   
 14 ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi  
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,  
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.   
 15 Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,  
otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.  
O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile  
ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.   
 16 Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.  
Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.  
Gịnị bụ uru ya,  
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?   
 17 Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,  
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.   
 18 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.   19 Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.   20 Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.