10
 1 Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.  
Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.   
 2 Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,  
ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.   
 3 Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,  
nʼihi na o maghị ihe.  
Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu*Ilu 13:16; Ilu 18:2 ọsịịsọ.   
 4 Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,  
ahapụla ọnọdụ gị,  
nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.   
 5 Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,  
dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.   
 6 Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu,  
ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.   
 7 Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya,  
ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.   
 8 Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya!  
Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.   
 9 Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị.  
Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.   
 10 Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ,  
ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ,  
a ga-etinye ike karịa,  
ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.   
 11 Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ,  
ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.   
 12 Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,  
ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi   
 13 Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,  
ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.   
 14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.  
Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,  
onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?   
 15 Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,  
ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.   
 16 Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,  
nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.   
 17 Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,  
nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike,  
ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.   
 18 Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;  
ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.   
 19 Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị,  
mmanya na-enye obi ụtọ,  
ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.   
 20 Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị†Ọpụ 22:28; Ọrụ 23:5;  
maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị,  
nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị  
nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.