12
 1 Ya mere, cheta Onye kere gị  
mgbe ị ka bụ okorobịa,  
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,  
na mgbe afọ aka abịarubeghị  
mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”   
 2 Tupu anyanwụ na ìhè,  
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,  
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.   
 3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,  
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,  
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,  
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,   
 4 mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,  
mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,  
mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,  
ma abụ ha niile na-ala ala,   
 5 mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;  
na ihe egwu nke okporoụzọ,  
mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru  
mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,  
agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.  
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,  
ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.   
 6 E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,  
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,  
tupu ite adawaa nʼisi iyi,  
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.   
 7 Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;*Jen 3:19; Job 34:15; Abụ 90:3  
mmụọ†Ekl 3:21 anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.   
 8 “Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.  
“Ihe niile bụ ihe efu!”   
Nchịkọta okwu niile 
  9 Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.   10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.   
 11 Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.   12 Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a.  
Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.   
 13 Ugbu a anụla ihe ndị a niile,  
ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:  
Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,  
nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.   
 14 Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,  
ya na ihe nzuzo anyị niile,  
ma ha dị mma ma ha dị njọ.