12
Abụ Otuto
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi.
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya*1Ih 16:8; Abụ 105:1;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụAbụ 145:4-6.;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ,Zef 3:14,15 bụkwaa abụ.
Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel.§Abụ 89:18 dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”*Zef 3:17

*12:4 1Ih 16:8; Abụ 105:1

12:4 Abụ 145:4-6.

12:6 Zef 3:14,15

§12:6 Abụ 89:18

*12:6 Zef 3:17