22
Ikpe ọmụma dịrị ndị eze ọjọọ 
  1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.   2 ‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.   3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.   4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.   5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”   
 6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,  
“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,  
dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,  
aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,  
dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.   
 7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.  
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.  
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,  
tụnye ha niile nʼime ọkụ.   
 8 “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’   9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”   
 10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,  
kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.  
Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;  
ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.   
 11 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.   12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”   
 13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,  
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,  
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,  
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.   
 14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,  
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’  
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,  
jirikwa osisi sida machie elu ya,  
werekwa penti*Ya bụ, mgba na-acha uhie uhie chọọ ya mma.   
 15 “Ị ga-abụ eze  
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?  
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?  
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi  
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.   
 16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,  
nke a mere na ihe niile gara nke ọma.  
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?  
Ka Onyenwe anyị kwupụtara   
 17 Ma anya unu na obi unu  
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi  
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,  
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”   
 18 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:  
“Ha agaghị eruru ya uju sị,  
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’  
Ha agaghị eruru ya uju sị,  
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’   
 19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.  
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya  
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”   
 20 “Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,  
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,  
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa  
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.   
 21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,  
ma ị jụrụ ige ntị.  
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.  
Ị jụkwara irubere m isi.   
 22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,  
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.  
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala  
nʼihi ajọ omume gị niile.   
 23 Gị onye na-ebi na Lebanọn,†Nke a bụ ụlọeze ahụ dị na Jerusalem, hụ nke a na 1Ez 7:2  
onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,  
lee ka i si‡Akwụkwọ ndị ọzọ ga-ede; lee ka ị si bụrụ onye a ga-emere ebere mgbe ihe mgbu na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,  
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.   
 24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,   25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.   26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.   27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”   
 28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,  
ihe onye ọbụla na-achọghị?  
Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,  
tụga ha na mba ha na-amaghị?   
 29 Ala, ala, ala,  
nụrụ okwu Onyenwe anyị.   
 30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru:  
“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,  
nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,  
nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,  
o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,  
maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”