26
Okwu Job
Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!
Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!
Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?
Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
 
“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,
ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;
mbibi*Maọbụ, Abadọn nʼasụsụ Hibru tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.
Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.
O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,
ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa
na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,
ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,
tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;
ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;
aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme
lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!
Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda§Egbe eluigwe nke ike nke ike ya?”

*26:6 Maọbụ, Abadọn nʼasụsụ Hibru

26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa

26:14 Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme

§26:14 Egbe eluigwe nke ike