13
Amụma banyere mmebi nke ụlọnsọ ukwu
1 Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”
2 Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”
3 Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, 4 “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?”
Mmalite nke ahụhụ
5 Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu. 6 Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 7 Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị. 8 Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.
9 “Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha. 10 Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile. 11 Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
12 “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 13 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị*Dan 9:27; 11:31; 12:11(onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu 15 Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. 16 Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. 17 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. 18 Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. 19 Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
20 “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ. 21 Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22 Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23 Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.
Ọbịbịa Onye nke nzọpụta
24 “Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ,
“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,
ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;
25 kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada,
ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’†Aịz 13:10; 34:4
26 “Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27 Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.
Ihe mmụta site nʼosisi fiig
28 “Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. 29 Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. 30 Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 31 Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
Mmadụ ọbụla amaghị oge ahụ
32 “Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya. 33 Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!‡Akwụkwọ ndị ochie na-edenye, na-ekpe ekpere. 34 Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.
35 “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. 36 Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. 37 Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”