6
Onye Nazirait
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi*6:2 Ịṅụ iyi maka mkpebi ị bụ onye Nazirait bụ ihe a na-adịghị akwagide mmadụ ka o mee. Ma oge ụfọdụ, nne na nna nwantakịrị nwere ike ṅụọ iyi nʼisi nwa ha. Mgbe mmadụ họọrọ ịṅụ iyi a, ọnọdụ a nwere ike bụrụ maka nwa oge nta, ihe dịka iri abalị atọ ma ọ bụkwanụ oge ndụ ya niile. Ma mgbe nne na nna ṅụrụ iyi a nʼisi nwa ha, nwa ahụ ga-abụ onye Nazirait nʼoge ndụ ya niile. Ọ dị ọkpụrụkpụ ụzọ ihe atọ na-eso ịṅụ iyi a: Nke mbụ, onye ahụ agaghị aṅụ mmanya maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Nke abụọ, dịka ọ na-adị ndụ, ọ gaghị akpụcha agịrị isi ya, ọ gaghị akpachakwa afụọnụ ya. Nke atọ, ọ gaghị emetụ ozu ọbụla aka. o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait, ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait,6:4 Onye e doro nsọ site na nkwa o kwere ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị. ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ, ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi. Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.
“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha. 10 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 11 Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ. 12 Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
13 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 14 Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo, 15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
16 “ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ. 17 Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
18 “ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
19 “ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ. 20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
21 “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”
Ngọzị nke ndị nchụaja
22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
24 “ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu
ma chebe unu,
25 Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,
ma meere unu amara,6:25 Jen 43:29
26 Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,
nyekwa unu udo.” ’
27 “Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”

*6:2 6:2 Ịṅụ iyi maka mkpebi ị bụ onye Nazirait bụ ihe a na-adịghị akwagide mmadụ ka o mee. Ma oge ụfọdụ, nne na nna nwantakịrị nwere ike ṅụọ iyi nʼisi nwa ha. Mgbe mmadụ họọrọ ịṅụ iyi a, ọnọdụ a nwere ike bụrụ maka nwa oge nta, ihe dịka iri abalị atọ ma ọ bụkwanụ oge ndụ ya niile. Ma mgbe nne na nna ṅụrụ iyi a nʼisi nwa ha, nwa ahụ ga-abụ onye Nazirait nʼoge ndụ ya niile. Ọ dị ọkpụrụkpụ ụzọ ihe atọ na-eso ịṅụ iyi a: Nke mbụ, onye ahụ agaghị aṅụ mmanya maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Nke abụọ, dịka ọ na-adị ndụ, ọ gaghị akpụcha agịrị isi ya, ọ gaghị akpachakwa afụọnụ ya. Nke atọ, ọ gaghị emetụ ozu ọbụla aka.

6:4 6:4 Onye e doro nsọ site na nkwa o kwere ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị.

6:25 6:25 Jen 43:29