24
Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara. Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. O buru amụma ndị a sị,
“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,
okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
 
“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
ebe obibi gị niile, gị Izrel!
 
“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
 
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
 
“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha nwere ike dịka atụ.
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?
 
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
Amụma Belam nke anọ
15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:
“Amụma Belam nwa Beoa,
amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,
onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.
Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
 
17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,
ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.
Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.
Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.
Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
18 A ga-emeri Edọm,*Ndị Edọm si nʼagbụrụ Ịsọ. Jen 36:1-9
Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.
Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.
Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
Amụma Belam nke ise
20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:
“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,
ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
Amụma Belam nke isii
21 Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:
“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,Ya bụ nke nʼadịgide adịgide
akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,
mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”
Amụma Belam nke asaa
23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:
“Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?
24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.
Ha ga-eji ike dobe ndị EbaEba bụ nna nna ndị Hibru. Jen 10:21; 1Ih 1:25-27 na ndị Ashọ nʼokpuru ha,
ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”
25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

*24:18 Ndị Edọm si nʼagbụrụ Ịsọ. Jen 36:1-9

24:21 Ya bụ nke nʼadịgide adịgide

24:24 Eba bụ nna nna ndị Hibru. Jen 10:21; 1Ih 1:25-27