Abụ Ọma 47
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Chineke bụ eze nke ụwa
1 Kụọnụ aka unu, unu mba niile;
jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.
Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;
ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,
ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya.
Sela
5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.
Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;
bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.*Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.
Jirinụ abụ too ya.
8 Chineke bụ eze mba niile;
ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,
dịka ndị Chineke nke Ebraham,
nʼihi na ndị eze†Maọbụ, ọta niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;
ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
*Abụ Ọma 47:6 Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
†Abụ Ọma 47:9 Maọbụ, ọta