Abụ Ọma 60
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu.
Ekpere maka nnapụta
1 O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;
i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro.
Sela
5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,*Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
7 Gilead bụ nke m,†Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32 otu a kwa, Manase bụkwa nke m;‡Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
8 Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
*Abụ Ọma 60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6
†Abụ Ọma 60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
‡Abụ Ọma 60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32