Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga
1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,*Ọpụ 14:21
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ†Jos 3:12-16;
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.‡Aịz 48:21; 1Kọ 10:4