Abụ Ọma 129
Abụ nrigo.
Ekpere megide ndị iro Izrel
Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ka Izrel kwuo.
“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ma ha enweghị ike merie m.
Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,
mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.
Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;
ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
 
Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị
bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.
Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ
nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;*Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2
nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,
maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,
“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.
Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”Rut 2:4

*Abụ Ọma 129:6 Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2

Abụ Ọma 129:8 Rut 2:4