Abụ Ọma 150
Ka ihe niile too Onyenwe anyị
1 Toonu Onyenwe anyị.
Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
3 Werenụ opi ike too ya,
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
5 werenụ ogene too ya,
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.*Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.
*Abụ Ọma 150:6 Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.